Posts

Showing posts with the label Umudike

Ụmụakwụkwọ Mahadum Michael Okpara emeela ngagharịiwe maka onye otu ha ụgbọala gburu

ỤMỤAKWỤKWỌ Micheal Okpara University of Agriculture (MOUAU), Umudike na steeti Abia emeela ngagharịiwe n’ihi ọnwụ otu onye n’ime ha n’ihi ihe mberede.   Nwaakwụkwọ nọ n’ogo nke ikpeazụ (500 level), n’ihe ọmụmụ Fishery and Aquatic Resources Management, Chidimma Ogbonna ka e kwuru na ụgbọala na-ebu ibu (truck) gburu na mgbede ụbọchị ụka n’Umudike n’ụzọawarawara Umuahia – Ikot Ekpene, nọ n’ọnọdụ ụzọ adịghị mma.   Ndị nọ ebe ihe mberede ahụ mere kwuru na ya bụ ihe dị oke egwu ma taa ọkwọụgbọala ahụ ụta, bụ onye ha kwuru na o jikwataghị ụgbọala ahụ n’ihi oke ịgba ọsọ.   Ya mere, ụmụakwụkwọ MOUAU, na njem ngagharịiwe ahụ kpebiri ịnọ n’okporoụzọ ganye na e dozie ụzọ ahụ adịghị mma. N’ihi ọnọdụ ahụ, ndị njem si ụzọ Umuahia – Ikot Ekpene aga tọkịịrị n’ụzọ ụbọchị ahụ.   N’ozi nke okwuputa okwu mahadum ahụ, Adanma Odefa tinyere aka na ya, ọ kọwara na ụlọakwụkwọ ahụ kwara arịrị maka ọnwụ ihe mgbu nke Nwaada Chidinma Ogbonna.   O kwuru na ọ bụ ụzọ adịghị mma kpatara ihe mberede ahụ ma rụtụkwa aka n