Obiano emegheela okporoụzọ Igwe Ezeudo n'Uke
A KPỌKUOLA ndị aka ji akụ n’ime steeti Anambra ka ha nyere gọọmenti aka n’ịkwàlite ọrụ mmepe obodo, site n’ịrụnyegasị ihe dị iche iche na-akwalite ọnọdụ obibindụ na ọnọdụ mmepe n’ime ime obodo dị iche iche na steeti ahụ. Gọvanọ Obianọ kpọrọ oku a na mmemme ịgbape okporo ụzọ a maara dịka ‘Igwe GNC Ezeudo Road’ dị n’okpuru ọchịchị Idemili North nke steeti Anambra, ma bụrụkwa nke ọ bụ onye ọrụ obi ebere, bụ Maazị Tochukwu Kpajie rụrụ ya. Ya bụ okporo ụzọ bụ nke ogologo ya dị otu kilomita, ma bụrụkwa nke e tinyesikwara ọkụ okporo ụzọ ji ike si anyanwụ arụ ọrụ na ya, tinyere ihe ndị ọzọ ga-eme ka ya bụ okporo ụzọ nọọ ọdụ etu o kwesiri, ma gharakwa imebì ngwangwa. N’okwu ya oge ọ na-agbape ya bụ okporo ụzọ, Gọvanọ Obianọ, nke onye nọchitere anya ya bụ odeakwụkwọ ọkpụtọrọkpụ n’isi ụlọ ọrụ na-ahụ maka ọrụ na steeti ahụ, bụ Maazị Emeka Ohuoha kelere nwa amadi ahụ rụrụ ya bụ okporo ụzọ maka inwe mmasị n’ihe gbasaara ọnọdụ mmepe obodo ahụ, ma werekwa ya dịka ihe na-echu ya ụra, bụzị nke mer