Posts

Showing posts with the label Ujunwa Offiah

Ejidela nwata nwaanyị dị afọ iri na asatọ tọọrọ onwe ya

AKA ndịuweojii akaparala otu nwata nwaanyị gbara afọ iri na asatọ maka ịtọrọ onwe ya iji napụta ezinaụlọ ya ego. Ọ bụ na Lagos ka ya bụ ihe mere.   Ujunwa Offiah ka e kwuru na ọ bụ ya na enyi ya nwoke kpara nkata ọjọọ ahụ ma gwa ezinaụlọ ya ka ọ kwụta nde naịra iri atọ (30million naira).   A nwụchịkọrọ ya na otu onye ọzọ aka ya dị n’arụrụala ahụ aha ya bụ Precious Chukwu gbara afọ iri abụọ na abụọ, ka a bịara idebere ha ego ahụ.   Kọmịshọna ndịuweojii steeti Lagos bụ Hakeem Odumosu kwuru na ya bụ ije bụ ịgba izu ọjọọ na ịhazị ntọrị mmadụ. Ọ kọwara na enyi nwoke Offiah bụ draịva Uber bụ onye nọ n’isi arụ ahụ ka nọ n’ọsọ, oge akụkọ jiri ru anyị aka.   Odumosu kwuru na ka e kwechara ndị ntọrị ahụ ọnụ (negotiation) e weturu ego ahụ na narị puku naịra asaa (N700,000).   Ka anyị cheta na n’ọnwa Juunu, a nwụchikọrọ otu nwata nwaanyị gbara afọ iri na asaa na steeti Ogun maka ịtọrọ onwe ya ma gwa nne ya ka ọ kwụta ụgwọ.