Udummiri na ihe so ya
UDUMMIRI so n’oge a na-enwe n’afọ. Ọ bara uru nke ukwu n’ihi na mmiri bụ ndụ, dịka ndị Igbo si ekwu. Ọ bụ n’oge udu mmiri ka e ji akọ ọrụugbo nke na-eme ka nri dị n’ụwa. E wepụ oge udummiri ihe oriri ga-adị ụkọ n’ụwa maka na ọ bụ mmiri na-enyere ihe a kọrọ n’ubi aka ime nke ọma. Ihe niile a na-akọ n’ugbo dịka ji, ede, akpụ, ọka, akịdị, akwụkwọnri na-ama pokopoko ugbu a n’ihi na oge a bụ oge udu mmiri. Mmiri kwụsị izo, ọ na-eme ka ihe ndị dị n’ubi kpọnwụọ. N’oge gboo, ọ bụ n’udummiri ka e ji arụ ọrụ ụlọ. Ọ bụ oge ahụ ka ha jị azọ aja were ya na-arụ ụlọ n’ike n’ike. N’oge ahụ, ndị mmadụ na-echekwube ya echekwube ma were ya rụpụta ụlọ. Ọ bụghị sọọsọ ụlọ ka a na-arụ n’oge udummiri n’ihi na ihe e ji mmiri eme buru ibu. N’oge udu mmiri, ndị mmadụ anaghị achọ mmiri achọ. Mmiri na-adị ebe niile ma na-egbo ọtụtụ mkpa. Ndị enweghị mmiri a na-echu echu na-eji oge udummiri nweta ma chekwaa mmiri ha ga-eji mee ihe afọ niile ganye na mmiri ọzọ amalitekwa zobe, yaabu ruo oge udummiri ọzọ. Ọ