Udu na ihe ndị e ji ya eme
UDU bara nnukwu uru na ndụ ndị mmadụ. Ma n’ala Igbo ma n’ala anyị niile gbaa gburugburu, e ji udu egbo mkpa dị iche iche. N’oge gboo, ọ bụ udu ka e ji echu mmiri. Onye ọbụla, ma nwoke, nwaanyị, ikoro, agbọghọ na ụmụaka na-eji udu echu mmiri. Otu ọghọm dị na ya bụ na onye ọbụla ji udu chu mmiri, ọ daa ada maọbụ udu ahụ dachapụ n’isi ya, ọ kụwaa. Onye ụdịrị ọnọdụ a dapụtara ebe o churu mmiri na-agba aka mmiri alọta. N’ihi ya, onye ọbụla ji udu chu mmiri na-ehi asaa n’anya ka ọ ghara ịkụwa udu. Udu na-adị n’ụdị dị iche iche. Ụfọdụ na-epe mpe ebe ụfọdụ na-ebu ibu zaa otooto afọ. Udu ndị buru nnukwu ibu ka e ji echekwa mmiri n’ụlọ. Ejighị ụdị ahụ echu mmiri. Ihe a na-eme bụ a na-echute mmiri a na-agbanye ya n’ime ndị ahụ. Ọbụladị mgbe mmiri na-ezo, a na-ejikwa udu echete mmiri. E wepu iji udu echu mmiri, e jikwa ya abanye ihe na mmiri. Ọmụmatụ bụ ihe dịka ịbanye akpụ ka o ruo. Ọ bụ n’udu ka a na-abanye akpụ n’oge gboo, o ruo, a yọọ ya. E jikwa udu echekwa ihe dị iche iche, dịka ihe