Posts

Showing posts with the label Uche Okafor

Speaker Anambra emeela ncheta ọmụmụ ya, kesàárà ndị Ayamelum ihe nkwàdo

Image
Ọ KPỌTỤRỤ akpọtụ ma zụọ azụọ na nsonso a n’Ifite-Ogwari, dị n’okpuruọchịchị ime obodo Ayamelum, dịka Ọkaokwu steeti Anambra, bụ Rt. Hon. Uchenna Okafor mere emume ncheta ụbọchị ọmụmụ ya, bụkwa nke ọgbụgba ahọ iri anọ na ise o jiri bịa ụwa.   Oke mmemme ahụ bụ nke weere ọnọdụ n’ụlọakwụkwọ ‘Central Primary School, Ifite-Ogwari, ma bụrụkwa nke dọtara imirikiti ndị mmadụ sitere mpaghara ebe ahụ, nakwa ọtụtụ ndị ọzọ e ji okwu ha agba izu, nke gụnyere ndị ọrụ gọọmenti na ndị ọzọ okwu ha na-ada ụda n’ọrụ gọọmenti na ngalaba ndị ọzọ dị icheiche, tinyere aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Chukwuma Soludo na ọtụtụ ndị ụlọ omeiwu steeti ahụ.   Ya bụ mmemme bụkwà nke Ọkaokwu ahụ nọrọ na ya wee kesàára ọtụtụ ndị mmadụ sitere n’ọgbọ nta nkwàdó ya ọtụtụ ihe nkwàdo na akụrụngwa dị icheiche ha ga-eji wee nyere onwe ha aka, na-achụtakwa ihe ha ga-eri, ma bụrụkwa ndị kwụụrụ onwe ha   Ihe dị icheiche o kesààrà ndị ahụ gụnyere àkpà nri ala (fetịlaịza) ruru narị isii n’ọnụọgụgụ, ụgbọala Toyota Camry ruru

Okafor akpọkuola ndị Anambra bi mba Ofesi ka ha wèlatruo akụ ha ụlọ

Image
ỌKAOKWU ụlọomeiwu steeti Anambra, bụ Maazị Uche Okafor akpọkuola ụmụafọ steeti Anambra nọgasị mba ofesi ka ha welataruo akụnụba ụlọ site n’ịbịa rụọ ụlọọrụ, ụlọ mmepụta ngwaahịa, maọbụ ihe mwunye ndị ọzọ, iji nye aka kwàlitekwuo ọnọdụ mmepe steeti ahụ. Maazị Okafor kpọrọ oku a oge ọ gara njem nleta n’ebe ahụ a na-arụ agadada ogige ụlọahịa ‘Akaeze Multi Services’, bụ nke a na-arụ n’Awka site na njikọaka ụlọọrụ na-ahụ maka nkwàlite ewumewu ụlọ na steeti Anambra. O tòrò ọrụ ahụ nà ogoogo e ji arụ ya, kwupụta afọojuju ya banyere ya bụ ogige a na-arụ, ma kelekwa onye na-arụ ogige ụlọahịa ahụ maka iwelataru akụnụba ya ụlọ. O kwuru na nke ahụ dabara adada n’oku ‘Akụ Ruo Ụlọ’ ahụ Gọvanọ Obianọ na-akpọ ndị Anambra bi na mba ofesi na ndị bi na steeti dị icheiche. O kwuru na a rụchaa ya bụ ụlọahịa, na ọ ga-enye aka ikewàpụta ohere ọrụ nye ụmụafọ steeti ahụ, ọkachasị ndị ntorobịa, tinyere ọtụtụ uru ndị ọzọ ọ ga-ewèta. O kelekwara aka na-achị steeti Anambra bụ Gọvanọ Obianọ maka ịdọtasị ndị ojiego a