Onye Igbo ọbụla kwesiri iji asụsụ ya na-eme ngala –Nworah
A DỤỌLA Ndị Igbo ọdụ ka ha were asụsụ ha kpọrọ ihe, jiri ya na-eme ngala, ma na-asụsikwa ya ike oge niile, dịka otu n’ime ụzọ a pụrụ isi wee chekwaba ya bụ asụsụ ka ọ ghara ịnwụ, ma nyefèkwa ya n’aka ọgbọ na-abịa abịa. Onyeisi ụlọ mgbasa ozi ‘Anambra Broadcasting Service’ bụ Maazị Uche Nworah bụ ya kpọrọ òkù a n’okwu ọ gwara Ka Ọ Dị Taa n’isi ụlọọrụ ya dị n’Ọka (Awka) banyere ụbọchị asụsụ ọdịnala na mba ụwa (International Mother Language Day) nke ahọ 2021, nakwa ọnọdụ asụsụ Igbo nọ na ya taa. Dịka o siri kọwaa, ụbọchị ahụ bụ ụbọchị pụrụ iche e wepụtara iji merube asụsụ ọdịnala na ndị na-asụ asụsụ ọdịnala na mba ụwa gbaa gburugburu, ya na ịkọwa mkpà ọ dị ịkwàlite asụsụ ọdịnala. O kwuru na asụsụ bụ ‘isi a hụrụ kwaba okpu’ n’omenala obodo ọbụla, bụ nke mere o jiri dị mkpa ka agbụrụ ọbụla kwàdo, kwalite ma na-echekwaba nke ha oge niile, ka o wee ghara ịnwụ maọbụ fuo. O kọwara na ámụmá ahụ òtù UNESCO buru sị na asụsụ Igbo ga-anwụ tupu ahọ 2050 bụ nke adabàghị adabà (n’agbanyeghị na ha