E liela nnukwu onye ntaakụkọ Uche Ezechukwu n'Amesi
E LIELA onye ntaakụkọ a maara aha ya n’ala anyị, Chiifu Uche Ezechukwu n’Amesi nke dị n’okpuru ọchịchị Aguata na steeti Anambra. Ndị mmadụ si ebe dị iche iche bịa Amesi wee sị ya gaa ije ya n’udo. N’okwu ya n’aja maasị elimozu ahụ nke a kara n’ụlọụka St Vincent Catholic Church, Amesi, Bishọp dayọsis Ekwulobia bụ Most Rev. Peter Okpaleke kelere Chineke maka ndụ Uche Ezechukwu ma riọ ka mkpuruobi ya zuo ike n’ndokwa. Bishọp Okpaleke gara n’ihu kpọkuo ndị mmadụ ka ha jiri ndụ ha na ọrụ ha na-agbara Chineke akaebe, ma na-akwalite ọdịmma mmadụ. N’okwu nke ya, Kọmishọna na-ahụ maka Mgbasaozi na Ikuziri Ọhanaeze Ihe Ha Kwesịrị Ịma na steeti Anambra bụ C. Don Adinuba kọwara Ezechukwu lara mmụọ dịka ezi enyi ya kemgbe ihe ruru afọ iri anọ. O kwuru na ha ebiela otu ebe ma rụkọkwaa ọrụ ọnụ. O kwuru na ọ gbara mbọ dị egwu n’ọrụ ma kpọkuo ezinaụlọ ya ka ha jiri ezi ndụ o biri wee nwee nkasi obi. Ada ya bụ Dọkịnta Chinwe Ezechukwu kwuru na ọ dị ya mwute dịka ya agaghị enwezi ike ya na nna y