Korona: Ụmụafọ Ossomala bi na USA ekesàràla ndị obodo ha erimeri
ỤMỤAFỌ obodo Ossomala dị n’okpuru ọchịchị Ọgbaru bi na mbaUSA ekesàarala ndị obodo ahụ akpa osikapa ruru iri abụọ na asatọ n’ọnụọgụgụ,iji belatara ha agụụ na ihe isi ike ndị ọzọ ha nwere ike ịdị na-agabiga n’imeoge ugbua n’ihi ọrịa nje korona. N’okwu ya na mmemmeikesà erimeri ahụ, bụ nke weere ọnọdụ n’obi eze ọdịnala obodo ahụ, bụ IgweVictor Awogu; onye nyefere ihe ndị ahụ n’aka ndị obodo ahụ (n’aha ndị butereya), bụ Oriakụ Ijeoma Uche kọwara na ọrịa korona a metụtara ma onye ukwu maonye nta n’ụzọ dị iche iche. Ọ kọwara na ọbụnadịndị ahụ butere ihe erimeri ahụ ka e kesesàára ha ketàkwàra òkè na mmetụta nkeoge ọrịa korona a, n’ihi na ha anaghịzị aga ọrụ ogologo oge niile ahụ gọọmentimba USA tiri iwu onye apụtakwala ezi; kama na o metụrụ ha n’obi inyere ha bụ ụmụnneha aka, bụzị nke mere ha jiri kpebie ikesàrà ha akpa osikapa ahụ. N’okwu nke ya nammemme ahụ, eze ọdịnala obodo ahụ, bụ Igwe Victor Awogu, nke onye nọchitereanya ya bụ otu onye n’ime ndị ichie ya, bụ Maazị Patrick Chukwu