E zuola anya nwa nwụrụ anwụ n’ụlọ nchekwa ozu UPTH
NA ‘University of Port Harcourt Teaching Hospital’ (UPTH), onye na-elekọta ebe a na-echekwa ozu abụrụla onye a na-atụ aka na ọ wepụrụ anya nwata nwụrụ anwụ, bụ ejima dị ọnwa iri na asatọ a kpọrọ Chuma,onye ọria akpọrọ ‘Anaemia’ gburu n’ụlọọgwụ ebe ụmụaka na-anọ n’ọnwa Ọgọọstụ na mkpụrụ ụbọchị atọ n’afọ 2018. Nna nwa a nwụrụ anwụ, bụ onye gaghachiri ịkwụ ụgwọ ebe ana etinye ozu ka ịzụ ụka abụọ gachaara, chọpụtara na ozu ha butere ya abụlụgo ihe ewepụrụ ihe na ya, ma ndị na-ahụ maka ịchekwa ozu na UPTH enweghị ike inye aziza banyere etu, mgbe ma ọ bụ ihe kpatara ụfọdụ ahụ ya ji bụrụ nke a na-achọ-achọ. Nna nwa a nwụrụ anwụ, na nkọwa ya, kwuru na, “mgbe nwa a ka na-eku ume, otu nwanyi nọọsụ bịakwutere m gwa m ka m kwụọ puku naira atọ iji lie nwa ahụ ebe ọzọ. Nke a mere ka iwe wee m. Site n’oge ahụ, ha bidoro mewe omume na-egosi na ọgbasaghị ha wee dobe ahụ na ha na-eche ọbara rue mgbe nwa a nwụrụ”. E kwuru na di na nwunye a emeela njem gaa Ugheli, ebe ndị ezinaụlọ ha gbara ha ume ka ha bu