NDLEA ejidela Dọkịta Mahadum UNN maka iji ọgwụ ntụ koken emepụta achịcha
AKA ndị ụlọọrụ ahụ na-ahụ maka ịñụ na ịtụ mgbere ọgwụ ike n’ala Nigeria, bụ ‘National Drug Law Enforcement Agency (NDLEA)’ anwụchiela otu onye ọrụ dọkịta, bụ Dọkịta Jane Chioma Ofoma maka ire na ịtụ mgbere ọgwụ ike site n’usoro nzikọrịtaozi ọgbaraọhụrụ. Onye na-ahụ maka mgbasaozi n’isi ụlọọrụ NDLEA, bụ Maazị Femi Babafemi bụ ya mere ka a mara nke a site n’ozi ọ kụpụụrụ ndị ntaakụkọ, bụkwa nke o siri na ya kọwaa na nwaanyị ahụ bụ Chioma (gbara ahọ iri abụọ na isii) gụrụ akwụkwọ ịbụ dọkịta na mahadum ala Nigeria, bụ ‘University of Nigeria, Nsukka (UNN)’ ma mechakwa ‘housemanship’ ya na nsonso a na mahadum ‘University of Benin Teaching Hospital’. Ọ kọwara na nwaanyị ahụ, onye nwere usekwu ‘Omachis Kitchen’ n’usoro nzikọrịta ozi ọgbaraọhụrụ, na-eji ọgwụ ike koken (cocain) na ọgwụ ike ndị ọzọ dị iche iche wee na-emepụta achịcha ekoghị eko bụ biskiiti na ụfọdụ ihe oriri ndị ọzọ, ma bụrụkwa nke ọ na-ere ma na-ekesàra ndị mmadụ na mpaghara ebe dị iche iche n’ala Nigeria. Ka ndị NDLEA nwe