Posts

Showing posts with the label UNIZK

Ụmụakwụkwọ mgbasaozi UNIZK emeela njem nleta n'ANPC

ỤMỤAKWỤKWỌ na-agụ banyere mgbasaozi (Mass Communication), ogo nke abụọ na Nnamdị Azikiwe University, Awka (UNIZIK), abịala njem nleta n’ụlọọrụ Anambra Newspapers and Printing Corporation, Awka (ANPC), bụ ndị na-ebipụta akwụkwọ akụkọ National Light, Ka Ọ Dị Taa na SportslightXTRA. Ndịnkuzi ha mmadụ abụọ duru ha bịa njem ahụ ka ha gbaara anya ha ekeresimeesi.   Onyeisi ụlọọrụ ANPC, Sir Chuka Nnabuife na ndị ọrụ ya gụnyere Editọ bụ Rose Oranye nabatara ha nke ọma ma mee ka ha ghọta tụpụ na gbalaga dị n’ọrụ mgbasaozi.   N’okwu ya, Nnabuife kelere ha maka ịbagide njem ahụ. O mere ka ha mata banyere ọtụtụ usoro a na-agbaso tupu e bipụta akwụkwọ akụkọ. O kwuru sị: ‘Ụlọọrụ a na-ebipụta akwụkwọ akụkọ National Light, Ka Ọ Dị Taa nke bụ akwụkwọ akụkọ a na-ede n’asụsụ Igbo. Sọọsọ ụlọọrụ a bụ ndị na-ebipụta akwụkwọ n’asụsụ Igbo. Ụfọdụ amalitele ibopụta nke ha na-etinye n’ime akwụkwọ ha ma ka ọ dị ugbua, anyị bụ ndị na-ebipụta akwụkwọ akụkọ Igbo. Akwụkwọ akụkọ ọzọ anyị na-ebipụta bụ akụkọ egwuregwu,