Nwa akwụkwọ UNIZIK anwụọla, oge ọkụ gbara ebe obibi ụmụakwụkwọ n'Awka
OTU nwata akwụkwọ mahadum Nnamdị Azikiwe dị n’Awka, zùtèrè ọnwụ mberede ya na nsonso a, oge ọkụ ọgbụgba dapụtara n’otu ụlọ ebe obibi ụmụakwụkwọ mahadum ahụ dị n’Ifite Awka, na steeti Anambra. Ya bụ ọkụ ọgbụgba bụ nke dapụtara ụbọchị Tuzdee n’ụlọ ụmụakwụkwọ a kpọrọ ‘El-Shadai Lodge’, ma bụrụkwa nke mere oge ite ikuku mmụọ (gas cylinder) e ji esi nri gbawara n’otu ime ụlọ dị n’ebe obibi ahụ mgbe onye nwe ya ji ya eghe ihe ọtịta ‘pop corn’. Dịka ndị ọnọmgbeomere siri kọwaa, ọkụ ọgbụgba ahụ mebisiri ọtụtụ ihe ụmụakwụkwọ ahụ jiri biri n’ụlọ ahụ. Mbọ niile ndị nọ ebe ahụ oge ahụ gbara iji gbanyụọ ọkụ ahụ bụ nke mara afọ n’ala, ma bụrụkwa nke amịtaghị mkpụrụ ọbụla, wee ruo oge ndị ọrụ nsọnyụọkụ steeti Anambra bịara ebe ahụ, wee gbanyụọ ọkụ ahụ, ma bupute ngwongwo ndị nke fọrọ afọ. Nwata akwụkwọ mahadum UNIZIK ahụ nwụrụ n’ọkụ ọgbụgba ahụ bụ onye e nyere aha ya dịka Precious, ma bụrụkwa onye e kwuru nà aja ụlọ ahụ dagidere n’elu, ebe ndị otu ya gbapụzịrị maka ndụ nke ha oge ha nyegideere