Ihe karịrị ndị ntaakụkọ 1200 ka e gburu n’ihu ọrụ site 2006 ruo 2020 – UNESCO
United Nations EducationaL, Scientific and Cultural Organisation (UNESCO) e kwuputala na ihe karịrị ndị ntaakụkọ dị otu puku na narị abụọ (1200) ka e gburu maka ịrụ ọrụ ha site n’agbata afọ 2006 ruo 2020. UN kọwara n’afọ 2020 na ihe karịrị mmadụ iri isii na abụọ tụfụkwara ndụ ha tinyekwara na iteghete n’ime iri ka ndị gburu ha na-aga n’enwe taghị ntaramahụhụ. N’afọ 2021, n’ihi ngụkọ ihe ndị a, International Day to End Impurity for Crimes against Journalists na-ekwuwapụta banyere ikpemwkwụmọtọ n’ọnọdụ ahụ. N’ozi ya nke ọ kpụrụ na Tuzdee, odeakwụkwọ zuzugbe (UN Secretary General), Antonio Guterres rụtụrụ aka na ọtụtụ ndị ntaakụkọ atụfuola ndụ ha dịka ha na-arụ ọrụ n’ebe e nwere nsogbu tinyere na ọnụọgụ ndị e gburu ebe enweghị esemokwu agbagoola na nsonso a. O kwuru sị: “N’ọtụtụ obodo (countries), sọọsọ inyocha wuruwuru, ịtụ mgbere mmadụ, ndị na-emebi ikike mmadụ nwere maọbụ ihe gbasara gburugburu na-etinye ndụ ndịntaakụkọ na nsogbu.” Ndịntaakụkọ na-agabigakwa ọtụtụ ihe ịmaaka gụn