Posts

Showing posts with the label Tummy-Tummy

COVID-19: Ụlọọrụ Tummy-Tummy ejirila igbe erimeri noduul kwàdo gọọmenti Anambra

NNEKWU ọkụkọ sị na ọ bụ ihe o nwere ka o ji eme ọgọ.   N’ịgbaso nke a,onyeisi ụlọọrụ ahụ na-ewu ewu n’imepụta erimeri noduul (noodle), bụ ụlọọrụTummy—Tummy, Maazị Chika Emenike ejirila nnọọ igbe noduul ruru otu puku n’ọnụọgụgụwee sị gọọmentị steeti Anambra ya jisie ike n’ọrụ na mbọ ahụ ọ na-agba imemila ọrịanje korona.   Maazị Emenike, oge ọna-enyefè igbe noduul ahụ n’aka gọọmenti, kwùrù na nke ahụ bụ ụzọ ụlọọrụ ahụ chọrọisi nye aka ma kwadokwa gọọmenti n’usoro dị iche iche o si agba mbọ ibelata agụụna mmetụ iwu onye apụtakwala ezi n’ahụ ụmụafọ steeti ahụ, bụ nke e tiri n’ihi ọrịanje korona.   O kwuru na ọ bụ ihekwesiri ekwesi ka gọọmenti na-eme, bụ ịgba mbọ hụ na ndị mmdụ nwèrè nri ha gana-eri ogologo oge niile ahụ a sị ha nọrọ n’ụlọ n’ihi ọrịa ahụ, maka na onyedunyere nwata inwude nkekwụ kwesikwara inye ya mmiri ọ ga-eji kwọ aka. O mekwazịrị ka a mara na o kwesighị ka a hapụrụ naanị gọọmentịime nke ahụ, ma sị na ọ bụ ya mere ụlọọrụ ahụ jiri kpebie iji ya erimeri noduulwee kwàdo ya.