Mmanwụ ekpoo elu dịka onyeisi ASATU riri ji ọhụrụ
A KỌWAALA mmemme iri ji ọhụrụ dịka otu n’ime omenala pụrụ iche e jiri mara ndị Igbo, nà omenala ha mebere kemgbe mgbe gboo. Onyeisi òtù jikọtara ndịisi ọchịchị obodo dị icheiche dị n’Anambra, bụ ‘Anambra State Association of Town Union (ASATU)’ Maazị Titus Akpudo bụ ya kwupụtara nke a na mmemme iri ji ọhụrụ nke ahọ 2022 o mere be ya n’obodo ya bụ Eziowelle, n’okpuruọchịchị ime obodo Idemili North nke steeti Anambra. Maazị Akpudo, onye bụkwa onyeisi ọchịchị obodo (PG) Eziowelle merùbèrè ya bụ emume iri ji ọhụrụ oge eze ọdịnala obodo ahụ bụ Igwe Okonkwo Etusi mèchàrà omenala Ịwa Ji obodo ahụ Ya bụ mmemme bụkwa nke dọtara ọtụtụ ụmụafọ Eziowelle, ndịisi ọchịchị obodo dị icheiche dịgasị n’Anambra, ndị ọrụ gọọmenti, ndị e ji okwu ha agba izu na ngalaba dị icheiche, tinyere ọtụtụ ndị ọzọ sitere ebe dị icheiche wee bịa. N’okwu ya na mmemme ahụ, Maazị Akpudo, onye eze ọdịnala obodo ahụ chiri echichi na nsonso a dịka “Ugwu Nyịrị Onye Ọsọ” mèrè ka a mara na mmemme iri ji ọhụrụ bụ nnukwu m