Posts

Showing posts with the label The Siere Foundation

Òtù 'The Siere Foundation' achịkọbala asompi ịkpọ ụbọ n'Anambra

Ọ KPỌTỤRỤ akpọtụ ma zụọ azụọ na nsonso a, dịka òtù nnọrọonwe a maara dịka ‘The Siere Foundation’ chịkọbàra ma hazie mmemme asọmpi onye kacha akpọ ụbọ na steeti Anambra, bụ àgbà nke mbụ ya a na-eme ụdị ihe ahụ n’ime steeti ahụ.   Ya bụ mmemme asọmpi wééré ọnọdụ n’Awka bụ nke a kpọrọ ‘Kedụ Ka Ị Si Mara Akpọ Ụbọ? (Nchọgharị Maka Onye Kachasị Mara Akpọ Ụbọ n’Anambra 2020’, ma bụrụkwa nke dọtara ọtụtụ ndị e ji okwu ha agba ìzù na ngalaba dị iche iche, tinyéré ọtụtụ ndị na-eme mmadụ obi añụrị, bụ ndị sitekwara ebe dị iche iche wee bịa isònyè na ya bụ mmemme.   N’okwu ya na mmemme ahụ, onye chịkọbàrà ya ma bụrụkwa onyeisi òtù ‘The Siere Foundation’ bụ Ọkaiwu Anthony Kelechi Agbasiere kwùrù na ebumnobi asọmpi ahụ na mmemme ahụ bụ iji kwàdo ndị ntorobịa, ma chọpụtakwa ọnatarachi zoro ezo ha nwèrè, sikwazie n’ụzọ dị etu ahụ kwàlite ọdịmma ndị ntorobịa na mmepe obodo.   Ọkaiwu Agbasiere, onye bụkwa onye ọrụ obi ebere ma bụrụkwa onye ọrụ ikpe na-ewu èwù na mba ụwà kèlèrè ndị dị iche iche tụnyere ụ