Posts

Showing posts with the label Tanzania

A ka m na-esekpuru ma na-asọpụrụ di m – Suluhu onyeisiala Tanzania

ONYEISIALA Tanzania bụ Samaia Suluhu ekwuputala na ya ka na-esekpuru ma na-asọpụkwara di ya ọbụladị mgbe ọ bụ osote onyeisiala Tanzania.   Samia, onye bụ nwaanyị izizi na-abụ onyeisiala na East Africa n’ihi ọnwụ Onyeisiala John Magufuli kwuru na ya na-esekpu n’ihu di ya n’ihi ịhụnanya na mmetụta.   Ya mere ọ kọwara na okwesighị ka a tụfuo ụdị omenala ndị ahụ n’ihi na ọ na-eme ka ụdọ jikọrọ ezinaụlọ sie ike ma mekwaa ka a zụlite ụmụaka n’ezi omume.   Samie kwuru sị: “Ụfọdụ n’ime ụnụ ga-asị na anyị ha nha anya n’ụzọ ọbụla n’obodo. Mba! Nke a abụghị ezi ọnọdụ. Ọbụladị dịka osote onyeisiala, ana m esekpu ala n’ihu di m.”   Ọ kọwara na ọ bụ n’ihi ịhụnanya na mmetụta ka o ji eme ya.   Ya emere, ọ kpọrọ oku ka e jidesie omenala ahụ ike maka ọdị mma ezinaụlọ.

Na Tanzania, ụmụ agbọghọ a chụrụ maka ịtụrụ ime mkpuke agụchaala akwụkwọ ha

..  Mụọ aka ọrụ ỤMỤ akwụkwọ ụmụ nwaanyị a chụpụrụ n’ụlọ akwụkwọ na Tanzania maka ịtụrụ ime mkpuke abụrụla ndị gụchara akwụkwọ ha. Ka nke a sịrị mee bụ na otu onye aha ya bụ Martina Simon bụ onye nkuzi lagoro ezumike, ma bụrụ onye gbara afọ iri asaa na asaa hibere ụlọakwukwọ nakwa ebe a na-elekọta ụmụ ha mụrụ ka ha nwee ike ịgụ akwụkwọ ha ma ọ bụ mụọ ihe ọbụla ha chọrọ n’enweghị nsogbu. Onye nkuzi a mere ka ụmụagbọghọ ndị a bụrụ ndị ga-ama aka nri na aka ekpe ha. Ọ dị mma ka ndị mpahara mba ụwa ndị ọzọ mụta ihe n’ọmume ọma onye nkuzi a mere  makana dịka ha gụchara kwụkwọ ugbu a ọ ga-enyere ha aka ịga n’ihu ibụ ezi ihe ọbụla ha chọrọ ibu. N’ezie, ị gaa n’ime ime obodo ị ga ahụ ụmụaka kwesịrị ịnọ n’ụlọakwụkwọ ma n’ihi afọ ime, ha bụzi ndị e dunyere ọgbọ nna ha nakwa ndị tọrọ nna ha ka ha lụba ha dịka nwunye. Otu n’ime ụmụaka ahụ tụrụ ime mgbe ọ dị afọ iri na asaa aha ya bụ Debra Emmanuel, nwatakịrị ahụ bụkwa onye ndị mụrụ ya chụpụrụ  n’ụlọ ma bụrụkwa onye a chụpụrụ n’ụlọakwụkwọ sokwa na n