A ka m na-esekpuru ma na-asọpụrụ di m – Suluhu onyeisiala Tanzania
ONYEISIALA Tanzania bụ Samaia Suluhu ekwuputala na ya ka na-esekpuru ma na-asọpụkwara di ya ọbụladị mgbe ọ bụ osote onyeisiala Tanzania. Samia, onye bụ nwaanyị izizi na-abụ onyeisiala na East Africa n’ihi ọnwụ Onyeisiala John Magufuli kwuru na ya na-esekpu n’ihu di ya n’ihi ịhụnanya na mmetụta. Ya mere ọ kọwara na okwesighị ka a tụfuo ụdị omenala ndị ahụ n’ihi na ọ na-eme ka ụdọ jikọrọ ezinaụlọ sie ike ma mekwaa ka a zụlite ụmụaka n’ezi omume. Samie kwuru sị: “Ụfọdụ n’ime ụnụ ga-asị na anyị ha nha anya n’ụzọ ọbụla n’obodo. Mba! Nke a abụghị ezi ọnọdụ. Ọbụladị dịka osote onyeisiala, ana m esekpu ala n’ihu di m.” Ọ kọwara na ọ bụ n’ihi ịhụnanya na mmetụta ka o ji eme ya. Ya emere, ọ kpọrọ oku ka e jidesie omenala ahụ ike maka ọdị mma ezinaụlọ.