Posts

Showing posts with the label TRADOC

TRADOC ènyéla ndị ọrụ nchekwa ala Nigeria ọzụzụ na nkụzi gbasara ịlụ agha

Ọ NA-ADỊ mma ịmụ àmụ tupu a pụta n’ọgbọ.   N’ịgbaso nke a, ngalaba na-ahụ maka nkụzi, nke ụlọọrụ agha ala Nigeria, bụ ‘Training and Doctrine Command (TRADOC)’ enyela ụfọdụ ndị ọrụ agha ahụ ọzụzụ na nkụzi banyere ịlụ ọgụ, ma kọwakwara ha ihe dị icheiche ha kwesiri ịmụta nà ihe ndị ọzọ ga-enyere ha aka n’ịrụ ọrụ ha nke ọma, dịka otu n’ime ụzọ isi wèta ajọ ọnọdụ nchekwa ahụ dị n’ala Nigeria ugbua n’isi njedobe.   Mmemme ahụ bụ nke weere ọnọdụ n’ogige ebe a na-enye ndị ọrụ agha ọzụzụ, bụ ‘Nigerian Army Table Hill, Kachia’ dị na steeti Kaduna, ma bụrụkwa ọzụzụ nke a maara dịka ‘Battle Inoculation and Firepower Demonstration’ bụ ótù n’ime ọzụzụ mmegharịahụ a maara dịka ‘Exercise Camp Highland’. Ọ bụkwa àgbà nke ikpeazụ nke ọzụzụ ime ọhịa e nyere ndị ahụ n’okpuru atụmatụ ‘Short Service Course’.   N’okwu ya n’ebe ahụ, onyeisi TRADOC, bụ ‘Major General’ SO Olabanji kwupụtara afọojuju ya banyere etu ndị ahụ e nyere ọzụzụ ahụ siri mee nke ọma, nke na-egosi na ha mụtara ihe a kụziiri ha nke ọma, ọ