Posts

Showing posts with the label Steeti Plateau

Gọvanọ Plateau akatọọla mwakpọ ndị na-achị ehi na steeti ahụ

OPEKATAMBE, mmadụ iri na otu atụfụ-ola ndụ ha n’ike ka ndị na-achị ehi (herdsmen) wakporo obodo a kpọrọ Ta’agbe nke dị na Miango, okpuru ọchichị Mangu na steeti Plateau. Ha gbakwara ụlọ ruru iri atọ n’ọnụgụ ọkụ, na mwakpo ahụ bụ nke daputara ka ọ gachara abalị abụọ ha wakporo obodo dị na gburugburu ahu bụ Ancha e ha gburu mmadụ abụọ.   Odeakwụkwọ Zuzugbe Irigwe Development Association (IDA), Danjuma Auta kwuru na ya bụ ihe mere eme n’ezie ma kọwaa na ndị oji egbe ahụ wakporo obodo ahu n’ihe dịka elekere iri nke abali ma kwaa igbo ihe ruru awa atọ n’enwegh ndị ọrụ nchekwa gbatara ọsọ enyemaka.   O kwuru na ha chị uche n’aka n’ihi na ha na ndị Fulani ndi ha ma anokọọla ọnụ ọtụtu oge kpaa maka udo, ma oke mwakpo ha malitewkwara na-eme ha mere ka ọ gbagwojuo ha anya, nke na ha amaghịzi na  nkata udo ha na ha kpara ọ dịzikwa ka ha siri kwu. Onye Uweojii na-ahụ maka mmekọrịta ha na ndị mmadụ (PPRO) na steeti ahụ, Ubah Gabriel Ogaba, osote supritendent (Assistant Superintendent), kwuputakwara