Na Lagos, e jidela mmadụ abụọ ọzọ maka ọgwụike
ỤLỌỌRỤ ahụ na-ahụ maka ibu agha megide ịñụ, ịkpọ, ire maọbụ ịtụ mgbere ọgwụike n’ala Nigeria, bụ ụlọọrụ ‘National Drug Law Enforcement Agency (NDLEA)’ ejidela otu nnukwu ọgaranya a na-enyo ènyó na o jiri ịtụ mgbere ọgwụike mere aka ọrụ. Onye na-ahụ maka mgbasaozi n’isi ụlọọrụ NDLEA, bụ Maazị Femi Babafemi bụ ya kwupụtara nke a site n’ozi ọ kụpụ̀ụ̀rụ̀ ndị ntaakụkọ a nsonso a. Dịka o siri kọwaa, nwoke ahụ, bụ Maazị Ugochukwu Nsofor Chukwukadibia bụ onye e nwètèrè mkpụrụ ọgwụike Tramadol ruru 13,451,466 n’ọnụọgụgụ n’aka ya, bụ nke arọ ya ruru 225mg, ma bụrụkwa nke ọnụ ahịa ya ruru ijeri naịra asatọ na ụma narị asatọ na isii (N8,860,000,000) ma e ree ya eree. O mere ka a mara na ọ bụ n’ụlọ nwoke ahụ dị n’ebe a maara nke ọma na mpaghara Victoria Garden City nke Lekki, dị na steeti Lagos ka e jidere ya bụ nwoke, bụ ebe a hụrụ o debesiri ọgwụike ahụ, nke o tinyesiri n’ìgbé, wee debesie ha ka ngwaahịa. Ọ kọwàrà na nwoke ahụ gbara ahọ iri anọ na ise bụ̀ nwaafọ Ihiala dị na steeti Anambr