Posts

Showing posts with the label St. Lucy

N'Awka, ụlọakwụkwọ St. Lucy emeela mmemme ngụcha akwụkwọ nke ahọ a

Ọ KPỌTỤRỤ akpọtụ n’ụlọakwụkwọ St. Lucy Model School, Awka, dịka ha mere mmemme ngụcha akwụkwọ, tinyere inye ndị mere emume nturugo mmụta, tinyere inye ndị mere nke ọma onyinye ịgba ume; ma si otu ahụ weta agụmakwụkwọ afọ 2021/2022 n’isi njedebe.   Emume a bụ nke mbụ ha na-eme kemgbe nsogbu korona.   E ji aja maasị dị asọ nke a kara n’ụlọụka St. Anthony’s Catholic Church, Ifite Awka, wee malite emume ahụ.   Ka a gbasara ụka, ndị niile tuuru ugo mmụta yi akwa nturugo ha kwụọ n’ahịrị n’ahịrị wee gaa n’ama egwuregwu ụlọakwụkwọ ahụ ma jiri egwu dị mma na-azọpụ ihe. Ha gụnyere ndị ntaakara, prịma na sekọndịrị.   Ụmụakwụkwọ ahụ mere ihe ngọsi dị iche iche, nke mere ka nne na nna ha, tinyere ndị ọbịa nwee obi ańụrị. Ndị sekọndịrị mere ihe ngosi ọrụaka dịka ịkwa akwa, ime ncha w.d.g.   Nwaada Peace Onyechege, tuuru ugo mmụta na prịma nke isii nwetara onyinye maka ịgba onye nke mbụ na klassị ya, tinyere onye kacha me nke ọma na prịma. E tukwara ya ugo dịka onye kacha me nke ọma n’asọmpi ajụjụ ọn