Aka akparala mmadụ atọ na Sri Lanka maka igbu ọdụm
NDỊ uweojii Sri Lanka anwụchịkọọla mmadụ atọ maka ijide magbuo ọdụm (leopard) ma na-achọ iri anụ yam aka iji ya gwọọ ọrịa ụkwara ụme ọkụ(asthma). A nwụchịkọrọ mmadụatọ ndị ahụ n’ụlọ ha ka a gbaara ndịuweojii ama na ha ji ụzọ dị aghaa (snare)wee mata anụ ahụ. Onyeisi, ChiefInspector Dushantha gwara ndị ntaakụkọ sị: “Ha bepụrụ isi anụmanụ ahụ ma gbuoya dịka ha ratara ya.” O kwuru sị na ndị ahụa na-enyo enyo atụfuola isi odu m ahụ n’ọhịa ma wepu ozu ya maka ire ahụ ya, anụya na akụkụ ahụ ndị ọzọ. Kangara kọwara na enwere nkwenye na anụ ahụ nwere ike ịgwọ ọrịa ụkwara ume ọkụ. Odum e nwere na SriLanka agaghị eru otu puku n’ọnụọgụ, dịka ha siri kwenye. Ya mere, onye ọbụla merụrụ anụmanụ ahụ ahụ ga-enwetantaramahụhụ ihe ruru nga afọ ise.