S'Africa achọọla mmekọ ha n'Anambra
ONYE nnọchị anya mbà South Africa na Nigeria, bụ Maazị Bobby Moroe abrịọla steeti Anambra, ka ya na mba ha jikọọ aka ọnụ na-emekọ akụnụba. Ya bụ nwoke bụ onye anabatara n’ebe obibi gọvanọ dị n’Amawbịa site n’aka Gọvanọ Willie Obianọ na ụfọdụ ndị isi ọchịchị steeti ahụ. N’okwu ya na nzuko ọ bịara n’Anambra, Maazị Moroe sị na o meela nnyocha wee chọpụta na ndị ntorobịa steeti ahụ bụ ndị na-agbasi mbọ ike, ma sị na ọ bụ ya mere o jiri sị ka ọ bịa kpọtụrụ steeti ahụ n’ihi na ha nwere mmasị n’iwulite ndị mmadụ na ịkwàlite njem nlegharị anya, ọlụ ugbo, ụlọ oriri na ọñụñụ na ụlọ mmepụta ngwọ ahịa. O kwuru na ọ chọpụtara na steeti ahụ nwere ihe onwunwe na ndị nwere ọgụgụ isi, ma sị na ọ bụ ya mere o jiri chọọ mmekọrịta ya na steeti ahụ, iji wee kwàlite ohere ọma na ohere ọhụrụ maka ndị ntorobịa steeti ahụ. N’okwu ọ gwara ndị nta akụkọ mgbe ha mechara nzùkọ ahụ, aka na-achị steeti ahụ bụ Gọvanọ Willie Obianọ mere ka a mara na steeti ahụ nwere ohere ọma ma gbasapụ aka ya maka njikọ aka ha na ndị