Soro m chịa
Ị KPỌỌ mmadụ agụ o nwee ọńụ mana ị kpọọ ya anụmanụ, o webe iwe – ọ bụ na agụ abụghị anụmanụ? 2. Ọ bụrụ na Ị ma ihe karịrị mmadụ atọ anaghị enyere mmadụ aka ihe ọ pụtara bụ na Ị bụ onye arịrịọ. 3. Otu nwoke mụtara ụmụ anọ, nke mbụ bụ dibịa oyibo, nke abụọ bụ lọya, nke atọ bụ njinịa, ebe nke anọ na-akwa baro. Otu onye agbataobi dụrụ nwoke ahụ ọdụ ka ọ chụpụ nwa ya na-akwa baro, ma ọ zara onye agbataobi ya si na ọ bụ sọ nke ahụ na-akwa bero na-akpata ego na ndị ọzọ enweghị ọrụ.