Achebe anọrọla n’ili turu ugo n’Awka
NDỊ otu Society of Young Nigerian Writers ngalaba steeti Anambra nọ ụbọchị Monde ọnwa Novemba dị n’abalị iri na isii n’afọ a bụ 2020 wee chikọba emume ome n’afọ, tinyere nkuzi agba nke mbụ e ji echeta Chinua Achebe, ọ ka ibe n’edemede. Emume ahụ nke weere ọnọdụ n’ọbaakwụkwọ Prof. Kenneth Dike e-Lirary, Awka, steeti Anambra bụ nọọ nke ndị mmadụ si n’ugwu na ndịda wee bịa; ha gụnyere ndị odeakwụkwọ, ntaakụkọ, ụmụakwụkwọ, ndịọrụoyibo, ndị nnọọrọonwe w.d.g. N’okwu ya, onyeisioche emume ahụ bụ Sir Chuka Nnabife bụ onyeisi (MD/CEO) Anambra Newspapers and Printing Corporation (ANPC) bụ ndị na-ebipụta akwụkwọ akụkọ National Light, Ka Ọ Dị Taa na SportsLight Xtra kwuputara na o kwesịrị ka a na-emerube emume icheta Achebe ọ bụghị sọọsọ na steeti Anambra, Nigeria, ụwa niile kama na ndụ. O kwuru sị na Achebe abụghị sọọsọ odeakwụkwọ dị egwu kama na ọ bụ onye nwere amamihe nke ukwuu. Nnabuife kwuru na Achebe edeghị akwụkwọ sọọsọ maka ọdinihu kama na ọ gbara mbọ maka ọdinihu, bụ nke mere ka o n