Ndị ntorobịa na-ede akwụkwọ achọọla njịkọ aka ANPC maka mmemme ncheta Chinua Achebe
NDỊ otu Society of Young Nigerian Writers (SYNW) bụ ndị ntorobịa na-ede akwụkwọ ngalaba Steeti Anambra awụchaala Anambra Newspapers and Printing Corporation (ANPC) bụ ndị na-ebipụta akwụkwọ akụkọ National Light, Ka Ọ Dị Taa na Sportslight Xtra dịka ha na-akwadobe emume ome n’afọ ‘2019 edition of the Chinua Achebe Literary Festival’. N’okwu ya na njem ahụ nke weere ọnọdụ na ANPC, onye nchịkọba (coordinator) otu Society of Young Nigerian Writers na steeti Anambra, Maazị Izunna Okafor kwuru na ebumnuche ha maka njem ahụ bụ inwe ezi mmekọrịta n’etiti ha na ụlọọrụ ahụ dịka ndị mgbasaozi,ya na maka ịrịọ ka ha na ha nyụkọọ mamịrị ọnụ ka o wee gbaa ụfụfụ iji wee hụ na emume nke ha na-akwadebe bụ Chinua Achebe Literary Festival nke afọ a gara nke ọma. Okafor kwuru na ya bụ emume ome n’afọ nke e bidoro n’afọ 2016 bụ nke a na-achịkọba maka ncheta na ịkwanyere Ọkammụta Chinua Achebe lara mmụọ ugwu, onye bụ ọka ibe n’edemede nke ude ya gazuru ụwa niile. O kwuru na ọ bụ iji wee gosipụta mbọ na ụtụ