Posts

Showing posts with the label SUBEB

Kaduna SUBEB achụọla ndịnkuzi 233 maka iweta asambodo adịgboroja

ỤLỌỌRỤ Kaduna State Universal Basic Education Board (KADSUBEB) agbaarala ndị nkuzi dị narị abụọ, iri ato na atọ (233) ụgbọ nwa mkpi maka ịjị asambodo adịgboroja wee nweta ọrụ.  Onyeisioche KADSUBEB, Tijjani Abdullahi kwuputara nke a n’okwu ọ gwara ndị ntaakụkọ, ọ kọwara na otu (board) ahụ nyochara asambodo narị anọ, iri ise na otu (451) site n’ịkpọtụrụ ụlọakwụkwọ ndị ha si nweta ha. O kwuru na ụsa ha nwetara site n’ụlọakwụkwọ ndị ahụ gbara ama na ndịnkuzi 233 wetara asambodo adịgboroja. Dịka ha na-agba mbọ ihụ na ndị nkuzi nwere nturuugu ha nwetara n’asambodo ha n’ezie, KADSUBEB mere amụma nnyocha (certificate verification exercise) n’ọnwa Epure afọ a bụ 2021. Ọ gara n’ihu kwuo na otu (board) ahụ ga-achụ ndị nkuzi 233 ahụ wetara asambodo adigboroja, dika a ga-achịgara ụlọọrụ na-ahụ maka ikpe (Ministry of Justice) akwụkwọ ha maka ikpe ha ikpe igwu ojoro.