Posts

Showing posts with the label SSANU

Ndị SSANU UNIZIK agaghariala maka onye òtù ha a tọọrọ

NDỊ òrù ahụ jikọtara ndị ọrụ oyibo nọ n’ogoogo dị elu namahadum Unizik, bụ ndị a mààrà dịka ‘Senior Staff Association of NigerianUniversities (SSANU,UNIZIK)’ akpọkuola gọọmenti steeti Anambra nakwa isi ọchịchịmahadum Unizik ka ha welitekwuo aka na mbọ ha na-agba ịhụ na a tọhàpụrụ ótùonye òtù ha bụ Maazị Emeka Chiaghana, onye ndị ntọ tọọrọ kemgbe ahọ gara aga.   Ndị òtù a kwupụtaranke a na ngagharị iwe ha mere n’ụzọ udo bànyere nke ahụ, bụkwa nke ha bùùrù weegaa n’obi gọọmenti dị n’Awka, ebe ha nọ wee kpọọ òkù ka a gbasikwuo mbọ ike ịhụna a tọhàpụrụ nwa amadi ahụ nke ta nke echi.   N’okwu ya banyerenke ahụ, onye ndu ndị òtù ahụ, bụ Oriakụ Nwangwu kwuru na ndị oji egbe ezu tọọrọya bụ nwoke n’abalị iri na ise nke ọnwa Ọkụtoba ahọ gara aga n’ebe obibi ya dịna Nibo, n’okpuru ọchịchị ime obodo Awka South nke steeti ahụ; ma kemgbe ụbọchịahụ, mmadụ ahụbeghị ya anya, ma ya fọdụzie ịnụ olu ya, ruo taa.   O kèlèrè gọọmentisteeti ahụ na mahadum Unizik maka mbọ ha gbàgòrò iji hụ na ha zọpụtara nwaa