Posts

Showing posts with the label SP Haruna Mohammed

Ndị uweojii ejidela nwaanyị chọrọ ire nwa ya N150,000 maka ụbịam

NDỊ ọrụ uweojii n’ime steeti Anambra nọrọ na nsonso a wee nwụchikọọ otu nwaayị maka ịkpa nkàtà ire nwa ya ọ mụrụ ọhụrụ ego dị otu narị, puku naịra na iri ise (N150,000) n’ihi agụụ na ihe isi ike.   Nke a bụ nke e mere ka ụwa mara site n’ọnụ SP Haruna Mohammed, bụ onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ndị uweojii n’ime steeti Anambra, bụ onye kụpụrụ ozi na nsonso a bànyere arụrụala ahụ na mnwụchi ahụ a nwụchiri ya bụ nwaanyị.   Dịka o siri kọwaa, nwaanyị ahụ, bụ Emila Sunday (kwúrú na ya dị ahọ iri abụọ na otu) bụ onye steeti Akwa Ibom, ma bụrụkwa onye aka ndị uweojii kpààrà n’Ojoto, dịka ọ na-akpà nkìtà ire obere nwa ya nwoke gbara naanị ọnwa atọ. O mere ka a mara na ọ bụ oge ndị uweojii nwetara ozi banyere nke ahụ, ka ha wụchàrà n’ebe ahụ ma nwụchie ya.   O kwukwara na oge a gbara ya ajụjụ ọnụ, na ya bụ nwata nwaanyị kwuru na ọ bụ maka ihe isi ike, ụbịam na agụụ ka o jiri chọọ ire nwa ya ahụ, ka o wee hụ ego ọ ga-eji zọọ isi onwe ya ma bàkwárá onwe ya úrù.   Otu ọ dị, ndị uweojii napụ