SEYAN ahọpụtala Ijegalu dịka okwuputa okwu ha
NDỊ ntorobịa obi na-anụ ọkụ, nọ n’otu a kpọrọ The South East Youth Assembly of Nigeria (SEYAN) emeela nhọpụta ndị ọchịchị ha, nke mbụ n’ala anyị (national executives) ka ha na-ahụ banyere otu ahụ, ọ kachasị ndị igbo. Nhọpụta ahụ, nke a nọ n’ụlọ ezumezu Anambra Newspapers and Printing Corporation (ANPC), Awka, bụ ndị na-ebipụta akwụkwọ akụkọ National Light, Ka Ọ Dị Taa, SportsLighTXTRA na Homeland gara nke ọma. Ndị mmadụ nọchitere anya steeti ise dị n’ala Igbo bịara ma were otu olu kwekọrịta n’ihe ha mere. N’okwu ya ozugbo a họpụtachara ya, onye jibu ọkwa dịka Onyeisi National Association of University Students (NAUS), bụzi Okwuputa okwu SEYAN, Simon Felix Ijegalu, na-anọchite anya Eziagu/Udi ‘Federal Constituency’ steeti Enugu, kwuru sị na ọdị mma na ọchịchọ ndị South/East dị mkpa. O gosipụtara afọ ojuju ya banyere otu e siri họpụta ya ka ọ bụrụ onye ndu otu ahụ. O kwere nkwa iji ike ya niile rụọ ọrụ. O kwuru sị: “Oge eruola mgbe anyị ga-eme ka ndị be anyị, ma ndị nọ n’ụlọ ma nd