Anambra: SEMA ekesàárála ndị iju mmiri wakpòrò ihe nkwàdo n'Ogbaru
GỌỌMENTI steeti Anambra, site n’okpuru ụlọọrụ na-ahụ maka ọnọdụ gbanụgbanụ, bụ ‘Anambra State Emergency Management Agency’ (SEMA) nọrọ na nsonso a wee kesàá ihe erimeri na ihe nkwàdo nyegara obodo iri na isii dị iche iche iju mmiri wakpòrò n’okpuru ọchịchị ime obodo Ọgbaru. Ụfọdụ ebe ndị ọzọ dị iche iche e kenyekwara òkè ihe nkwàdo na erimeri ahụ gụnyèrè Ogbeukwu, Iyiowa, ogige nlekọta ‘Madonna Mercy Family International’ bụ ebe a na-elekọta ndị nọ n’ọrịa nakwà ndị agadi, tinyere ogige ụmụaka enweghị nne na nna, bụ ‘Madonna Angels Orphanage Home’ dị n’Atani; na ụlọakwụkwọ ‘King’s Ambassadors Seminary School’ dị n’Ọgbarù ahụ. Mmemme ikesà ihe nkwàdo na erimeri ahụ bụ nke weere ọnọdụ n’ogige isi ụlọọrụ okọuru ọchịchị ahụ dị n’Atanị, ma bụrụkwa nke onye lekọtara ya bụ Maazị Nnamdi Esimai, bụ onyeisioche òtù na-ahụ maka mbute na nkesà ihe nkwàdo, ihe enyemaka, nà erimeri nyegara ndị iju mmiri wakpòrò na mpaghara ahụ. N’okwu ya na mmemme ikesà ihe ndị ahụ, onyeisioche nchere oge n’okp