RoLAC na gọọmenti Anambra eweputela akwụkwọ maka asụsụ mmegharịahụ
NJIKỌAKA gọọmenti steeti Anambra na òtù ‘Rule of Law And Anti-Corruption, RoLAC’ amịtakwala ezi mkpụrụ ọzọ, dịka òtù abụọ ahụ bipụtara ma wepụta akwụkwọ ndekọta nkọwa maka asụsụ mmegharịahụ. Mwepụta akwụkwọ ahụ a kpọrọ (na bekee) “Directory Of Sign Language Interpreters” bụ nke weere ọnọdụ n’Awka ma bụrụkwa nke RoLAC mere site na njikọaka ụlọọrụ gọọmenti steeti Anambra na-ahụ maka ọdịmma ọhaneze na ihe metụtara ụmụaka na ụmụnwaanyị. Ya bụ akwụkwọ ndekọta bụ nke depụtasịrị aha mmadụ niile e nyere ọzụzụ n’asụsụ mmegharịahụ (sign language) na steeti Anambra nà ihe ndị ọzọ dị mkpa banyere ya bụ asụsụ na ndị na-akọwa ya. N’okwu ya na mmemme ahụ, onyeisi RoLAC na steeti Anambra, Oriakụ Josephine Onah kèlere gọọmenti steeti Anambra maka nkwàdo dị iche iche ọ na-enye ndị ikedịnobi, bụ ndị nwere nkwarụ n’otu akụkụ ahụ ha maọbụ nke ọzọ. O mere ka a mara na ọchịchị Gọvanọ Obiano enyele ndị ikedinobi ohere na ezi ọnọdụ kwesiri ekwesi ma mee ka ha soro n’ihe a na-eme na gọọmenti ya, ma kwez