Posts

Showing posts with the label Rev Fr'. Aniscetus Offor

Emeela aha Fada Offor ka ọ dị ọkpụtọrọkpụ

‘BISHOP’ Jonas Benson Okoye, bụ onye enyemaka bishọpụ nke ụka Katọlik,Dayọsis Awka agoziela ma gbapee ogige a kpọrọ ‘Calvary Victorious Garden’ nke a lụrụ n’aha ‘Rev Fr’. Aniscetus Offor,nwaafọ Umuchu, onye lagoro mmụọ. Ọ bụ Mazi na Oriaku Onyeka Francis Offor lụrụ ogige a na ‘St Pauls Catholic Church’, Achalla Umuchu, nke dị n’okpuru ọchịchị Aguata na steeti Anambra. Ha rụrụ ogige a iji wee mee ka aha nwanne ha nwoke bụ ‘Rev. Fr’. Anicetus Offor dị ọkpụtọrọkpụ. A mụrụ Fr. Offor ka ọnwa ‘April’ dị na mkpụrụ ụbọchị iri na iteghete n’afọ 1968 ma chie ya ụkọchukwu ka ọnwa Ọgọstụ dị na mkpụrụ ụbọchị iri na iteghete, n’afọ 1995. Ọ nwụrụ ka ọnwa Machị dị n’ụbọchị iri na asatọ n’afọ 1996, nke bụ ọnwa asaa e jiri chie ya ụkọchukwu. E liri ya na ‘St Patrick’s Cathedral, Awka n’Eprel, 1996. Ka ọ na-agozi ogige a ‘ Most Rev’. Jonas Benson Okoye toro ezinaụlọ ndị be Offor, ọ kachasị Mazi na Oriaku Onyeka Offor, maka icheta nwanne ha nwoke bụ Fr Anicetus Offor, onye nke nwụrụ n’ike n’ihi ihe mbered