Posts

Showing posts with the label Prophet Uhembe Jacob

E gbuola onyeamụma asịrị na o ji ịnapụ ụmụnwoke amụ akpa ego na Benue

ỤFỌDỤ ndịntorobịa iwe na-ewe egbuola otu onyeisi ụka aha ya bụ ‘Prophet’ Uhembe Jacob, nke ụlọụka ‘Divine Shadow Church’ n’ihi na ọ dị ka aka ya ọ dị n’amụ ụmụnwoke nke malitere ifu aghara aghara na mba Daudu nke dị n’okpuru ọchịchị Guma na steeti Benue.   Ndị obodo ahụ gara n’ihu gbaa ụlọụka ahụ ya na ụlọ ndị ọzọ Uhembe nwe, tinyekwa ụlọ nke onye ọzọ e kwuru na aka ya dị n’arụ ahụ nwe.   Uhembe, onye hibere (founder) ụlọụka ahụ  n’onwe ya ka ndị bi n’ogbe ahụ kwuru na ọ na-anapụ onye ọbụla amụ ya na-efu efu narị puku naịra na ụma iri abụọ (N120,000) tupu o mee onye ahụ, ka amụ ya chigha azụ.   Ndị nọ oge o mere kwuru na onyeisi ụka ahụ egburu egbu gbara mbọ ka ọ agbapụ gbalaa steeti Nasarawa bụ agbataobi ha mana ndịntorobịa ahụ jidere ya gbuo ma likwaa ya.   Ka ihe a mechara, ndị ụka ya jiri foto (posters) ya mee ngaghariiwe kwuo na ha chọrọ ikpemkwụmọtọ banyere ya.   Onye na-ahụ maka ọdị mma ndị mmadụ na ndị uweojii na steeti Benue, Catherine Anene kọwara n’ozi ya na e gburu onyeamụm