Posts

Showing posts with the label Progressive Anambra Youths

Ndị òtù PAY achịkọbarala ndị ntorobịa ọgbakọ nkuzi n'Awka

A KỌWAALA mkpa ọ dị na ndị ntorobịa ga-amụta ọrụ aka ma mụtakwa usoro e ji achị ezi ọchịchị, dịka ihe ga-enyere ha aka ịbụ ndị ga-ewèta mgbanwe n’ime obodo ha dị iche iche.   Nke a bụ isi sekpụ ntị nakwa okwu a kpụ n’ọnụ na nnukwu ọgbakọ otu ụbọchị a chịkọbarààrà ndị ntorobịa steeti Anambra site n’aka òtù nnọrọ onwe a maara dịka ‘Progressive Anambra Youths (PAY),’ bụkwa nke weere ọnọdụ n’Awka bụ isi obodo steeti Anambra.   N’okwu ya oge ọ na-enye nkuzi na mmemme ahụ, onyeisi ụlọ mgbasa ozi ‘Anambra Broadcasting Service’ bụ Maazị Uche Nwọrah kpọkùrù ndị ntorobịa ka ha na-akwádo onwe ha ma na-adị njikere oge niile ichere òhèrè ọma, ma chetakwara ha na ọchịchị bụ ọkpụkpọ òkù ịrụ ọrụ, bụkwa nke ọ kwuru na mmadụ apụghị ịrụnwu nke ọma ma ọ bụrụ na o nwetaghị ezigbo ọzụzụ ma ọ bụ kwado onwe ya nke ọma.   O kwuru na ezi ọchịchị chọrọ onye ñụjuru mmiri ara afọ, onye nwere ọgụgụ isi, nakwa onye ọdịmma ndị ọ na-achị na-echu ụra karịa ọdịmṅa nke ya onwe ya, ma kpọkuzie ndị ntorobịa ka onye ọbụla n