Kedụ ihe ịma banyere Prince Philip?
A MỤRỤ Prince Philip na Greek ‘Island’ nke Corfu na Juunu 10, 1921. 2. Ọ lụrụ nwunye ya bụ Queen Elizabeth II n’afọ 1947; afọ ise tupu ọ bụrụ Ezenwaanyị. 3. Ya bụ Duke nke Edinburgh nọ n’akụkụ nwunye ya ihe karịrị afọ iri isii n’ọchịchị ya. 4. Ya bụ onye ọrụ ‘royal consort’ kacha nọọ ogologo oge na mba Britain. 5. Prince Philip na Queen Elizabeth mụtara ụmụ anọ, ụmụ ụmụ asatọ, ụmụ ụmụ ụmụ iri. A mụrụ diọkpara ha bụ Prince nke Wales, Prince Charles n’afọ 1948; mụọ ada ha Princess nke Royal bụ Princess Anne n’afọ 1950; mụọ Duke nke York bụ Prince Andrew n’afọ 1960 ma mụọ Earl nke Wessex bụ Prince Edward n’afọ 1964. 6. Nna ya bụ Prince Andrew nke Greece na Denmark, obere nwa nwoke King George I nke Hellenes. 7. Nne ya Princess Alice bụ nwa Lord Louis Mountbatten ma bụrụ nwa nwa Queen Victoria. Prince Philip, di Queen Elizabeth II nke England, bụ Duke of Edinburgh nwụrụ na Fraịdee izuụka gara aga ọnwa Epure dị n’abalị iteghete. Ọ gbara afọ iri iteghete na iteghete tupu ọ laa mmụọ.