Posts

Showing posts with the label Peter Umeadị

Umeadi ejirila mmemme mgbede kpọkọba ndị nkà na ndị enyi ya na Nri

Image
Ọ KPỌTỤRỤ akpọtụ ma zụọ azụọ na nsonso a, dịka ndị ọkwa nkà, ndị odee, nakwa ndị na-eti egwu zùkọrọ na ngwùrù be onye otu ha bụ Ọkammụta Peter Umeadị na nsonso a, wee nwee ọnọdụ ụwa mgbèdè, ma jirikwa nkà ha mee onwe ha obi ụtọ.   Mmemme ụwa mgbede ahụ bụ nke a chịkọbara site n’aka Ọkammụta Peter Umeadị, bụ ọkaikpe steeti Anambra n’oge mbụ, ma bụrụkwa nke were ọnọdụ na be ya dị na  Nri, n’okpuru ọchịchị ime obodo Anaọcha.   Mmemme ahụ bụ ke a kpọrọ “Imirikiti Ndị Nwere Uche Nkà: Mgbede Nnọkọ Peter Umeadị Na Ndị Enyí Ya” (“A Plethora of Creative Minds: An Evening with Peter Umeadi and Friends), ma bụrụkwa nke dọtara ọtụtụ ndị e ji okwu ha agba ìzù, ndị nwere uche nkà na ndị nwere ọnatarachi dị iche iche sitere steeti Anambra na mpụga ya.   N’okwu mmalite ya na mmemme ahụ, onyeisioche na ya bụ ọgbakọ, bụ Oriakụ Loretta Aniagolu kọwàrà nkà dịka ihe dị oke mkpà n’obodo, ma kọwaa ndị na-eme nkà dịka ndị nwere ihe ọ ga-ewe iji kwàlite ọganihu mmepe obodo ọbụla.   O kelere ya bụ nwa amadi chị

Ọka Ikpe Umeadị abaala APGA

NWA amadi ahụ jibụrụ ọkwa dịka ọka ikpe steeti Abambra, bụ ọka ikpe Peter Umeadị abanyela otu ndọrọ-ndọrọ ‘All Progressive Grand Alliance’ (APGA). Nke a bụ nke mere ụbọchị Wednezdee, ka ọ gachaara ihe dịka otu izu ụka ya bụ nwa amadi jiri laa ezumike nka n’ọrụ ya dịka onye ọrụ iwu. N’okwu ya na mmemme ịbanye na ya bụ otu ndọrọ-ndọrọ, maazị Umeadị mere ka a mara na ebumnobi ya jiri banye igwù okwe ndọrọ-ndọrọ ọchịchị bụ ka o soro tụnyekwa ụtụ nke ya n’ịkwàkite mmepe obodo na ezi ọchịchị na steeti Anambra na n’ala Nigeria n’izugbe. O kwukwara na otu n’ime ihe o jiri bànye otu ndọrọ-ndọrọ APGA bụ na ọ hụtara ya dịka otu ndọrọ ndọrọ maara nke ekwe na-akụ, tinyekwuoro na ọ ga-enye ya ohere inyere gọvanọ Obianọ aka n’ọrụ ọma dị iche iche o ji na steeti Anambra. O mere ka a mara na ọ bụrụ na mmadụ were maka na ọ lara ezumike nka wee rahụbazie ụra, ụbụrụ onye ahụ alabakwuo ezumike nka; ma kwuo na ọ bụ ya mere o ji sị mba, na ya agaghị anọ rahụba ụra, ebe ya ka nwere ọtụtụ ihe n’ime ya nakwa ọn