Posts

Showing posts with the label Peter Tabichi

Onye Africa tuuru ugo dịka ọka ibe na nkuzi n'ụwa niile ezutela Trump na White House America

ONYE kacha bụrụ ezigbo onyenkuzi n’ụwa niile (best teacher),  Peter Tabichi, onye Kenya ga-ekwu okwu na nzukọ United Nations General Assembly, agba nke iri asaa na anọ ya. Nzukọ ahụ ga-adọta ndị ọchịchị dị iche iche n’ụwa.   Tabichi, onye tutere ugo dịka ‘2019 Global Teacher Prize’ n’ọnwa Maachị afọ a bụ onye otu echichi ụka a kpọrọ St Franscan Friars; nke bụ otu echichi nke onye dị asọ Frincis nke Assisi hibere mgbe elu bụ ala ọsa (13th century).   Ọ na-akụzi ihe ọmụmụ sayensi na Keriko Mixed Day Secondary School, Pwani-Njoro nke dị na Nakuru. Stephanie Grisham, odeakwụkwọ (White House Press Secretary) a gbasaala ozi n’ikuku nke kọwara na Tabichi ezutela Donald Trump, na-achị mba America.   O kwuru sị “Peter, ị na-akpalite mmụọ anyị! Daalụ maka mbọ ị na-agba n’isi ụmụakwụkwọ gị.”  N’akụkụ nke ya, Brother Tony Donald onye nke si Ireland kwuru sị “Nke a bụ nnukwu ugwu (honour) n’ebe ndị otu Broda nke Francis dị asọ nọ. O gosịrị na UN chọpụtara mbọ dị egwu otu echichi anyị na-agba maka ọ