Na ngalaba niile, ọchịchị Obiano na-amuke ka ihe – Eze
ỌCHỊCHỊ bụ ihe na-agụ mmadụ niile nọ n’ụwa mana ajụjụ bụzị mmadụ ole ka a ga-asị chịa ka ha mara chịa. Ọchịchị bụ ngọzi si n’aka Chineke wee na-abịa, ejighị ike eme ya. Ya mere, ọha na eze ndị steeti Anambra akọwaaala aka na-achị Anambra bụ Gọvanọ Willie Obiano (Akpọkuodike) dịka onye ọchịchị maara ihe ekwe na-akụ, onye ọchịchị ya na-amụke ka ihe na ngalaba niile. Iji kọwaa isiokwu a, Peter Eze bụ onyeisi ‘Managing Director’ Ndiolu Micro Finance Bank Limited nke dị n’obi gọọmenti, Awka ekwuola na Chineke gọziri ndị steeti Anambra site n’iwebata mmadụ dịka Obiano ka gọvanọ. Eze kwuru sị; “Ndị be anyị na-echebu na onye ọbụla ga-achị ọchịchị ga-abụrịrị onye akpụ obi ma ndị mmadụ amatala na ezigbo mmadụ na-achị ọchịchị.Ndị mmadụ hụrụ ọchịchị Obiano dịka nke onye nwere obi ịhụnanya ebe ndị ọ na-achị nọ. O nwere obi Chineke, ọ naghị achị ọchịchị nchịgbu.” Eze gara n’ihu kọwaa na Obiano na-amuke ka ihe na ngalaba niile dịka ụlọọgwụ, ụzọ, n’ebe ndị ọlụ nọ wdg, nke mere onye ọbụla ji enwe aǹụrị