Posts

Showing posts with the label Patrick Udoba

Udoba ekesàála ihe nkwàlite agụmakwụkwọ, gbaara ọtụtụ mmadụ Ekeresimeesi

Image
OKE ọñụ dàrà n’okpuru ọchịchị ‘Anambra West’ nke steeti Anambra na nsonso a, dịka onye na-anọchite anya ọgbọ nta nkwàdo okpuru ọchịchị ahụ n’ụlọ omeiwu steeti Anambra, bụ Maazị Patrick Udoba kesààrà ụlọakwụkwọ praịma ruru iri ise na asatọ dị n’okpuru ọchịchị ime obodo ahụ ihe dị iche iche e ji akwàlite ọnọdụ agụmakwụkwọ na mmụta.   Ya bụ mmemme wééré ọnọdụ n’Ụmụeze-Anam bụ nke ụmụakwụkwọ na ndị nkuzi sitere ụlọakwụkwọ praịma niile dị n’okpuru ọchịchị ahụ wee sonye na ya, ma bụrụkwa nke dọtara ọtụtụ ndị dị iche iche e ji okwu ha agba izù na steeti ahụ, ndị ọrụ oyibo, ndị ọrụ ụka, nakwa ndị eze ọdịnala sitere obodo dị iche iche e nwere n’ime okpuru ọchịchị ahụ.   A nọkwara na ya bụ mmemme wee kesàárá ụlọakwụkwọ praịma niile ahụ ihe dị iche iche gụnyere akwụkwọ e ji ede ihe, akpụkpọ ụkwụ, mkpịsị odee na ọtụtụ ihe ndị ọzọ e kesààrà ụlọakwụkwọ niile ahụ. Onye omeiwu ahụ nọkwàzịrị na ya bụ mmemme wee kesàára ndị ọgbọ nta nkwàdo ahụ ọ na-anọchite anya ha n’ụlọ omeiwu àkpà osikapa na ego, maka