Posts

Showing posts with the label Ozubulu

Ndị ojiegbe a kpaala mkpa mkpa n’ụlọọrụ nchekwa dị na Ozubulu

KA Ọ GACHARA abalị ole na ole ha jiri wakpòchaa Ichida dị n’okpuru ọchịchị ime obodo Anaọcha na Awka-etiti dị n’okpuru ọchịchị ime obodo ‘Idemili South’ nke steeti Anambra, ndị ojiegbe ezu nọkwara na nsonso a wee wakpò ụlọọrụ ndị nchekwa obodo ọzọ na steeti ahụ.   Mwakpò ahụ bụ nke ndị ọjọọ a mere n’ụlọọrụ ndị nchekwa obodo dị n’Ọzụbụlụ, n’okpuru ọchịchị ime obodo Ekwusigo na steeti ahụ, ma bụrụkwa nke ha sitere na ya wee gbagbuo mmadụ anọ n’ebe ahụ, nke gụnyere ndị ọrụ nchekwa obodo ahụ, ndị ótù onye n’ime ha bụ osote onyeisi ndị ọrụ nchekwa ahụ, onye a maara dịka G.O.D.   Akụkọ kọrọ na ọdachi ahụ dapụtara ụbọchị ụka, malite oge o jiri ọkara gaa elekere anọ nke mgbede, wee ruo n’ihe dị ka elekere isii nke mgbede ahụ.   Dịka ụfọdụ ndị ọnọmgbeomere siri wee kọwaa, ndị ojiegbe ahụ jiri ụgbọala ‘Toyota Sienna’ wee wụchaa ebe ahụ na mgbede ahụ, ma malite ịgba égbè aghara aghara, nke ha sitezịrị na ya wee gbagbuo mmadụ anọ ahụ.   Ndị ahụ mebìsìkwara ụfọdụ ihe n’ebe ahụ, kpọghèpù ndị a kpọch

Ozubulu: Bishop Okeke akatọọla ndọrọndọrọ n’ụlọụka, ịwakpo ndị ụka

BISHOP ụka Katọlik dayọsịs nke Nnewi, ‘Most Rev’ Hillary Okeke akwaala arịrị maka ịtụfu ọtụtụ ndụ nke dapụtara na mwakpo a wakporo ndị ụka na St Philip’s Catholic Church, Ozubulu na steeti Anambra n’afọ 2017.   Bishọp Okeke, onye kwuputara nke ahụ ka ọ na-edogharị ụlọụka ahụ asọ (re-dedication) dịka a rụgharịchara ya kpọkuru ndị otu Kraist ka ha na-asopụrụ adịmasọ nke ụlọụka ahụ dịka nke nwere ikike na nchekwa Chukwu.   O kwuru sị na Kraist gosipụtara ịhụnanya, ma kpọkuo ndị mmadụ ka ha na-ahụrịta ibe ha n’anya dịka ọ rụtụrụ aka na ịhụnanya n’ebe mmadụ na ibe ya nọ bụ ihe mere ka okpukpere Kraist dị iche n’ebe okpukperechi ndị ọzọ nọ.   Ọ kwuru sị na dịka ọ bụ ụlọnsọ Chineke, o kwesịrị ka a na-ahụ ya dịka ebe ndị kwere ekwe na-ekpe ekpere, ọbụghị ebe a na-eme ndọrọndọrọ  (politics). Ya mere, ọ dọrọ aka na ntị maka iji ụlọụka eme ihe ndị na-anaghị enye Chineke otito.   O kelere Aloysius Ikegwuonu, onye Ozubulu rụrụ ụlọụka ahụ, tinyere mmeso ọma ya n’ebe ndị mmadụ nọ.   N’akụkụ nke ya, I