Atụmatụ mmiri mpaghara Otuocha ga-amalite ọrụ n’ọnwa April – Obianọ
AKA na-achi steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obianọ ekwuolana atụmatụ mmiri mpaghara Otuọcha, bụ nke a maara dịka “Otuocha RegionalWater Scheme” ga-amalite ịrụ ọrụ tupuu ọnwa April nke ahọ a. Gọvanọ Obianọ mèrèka ụwa mara nke a n’okwu ya oge ọ gara njem ileta ka ọrụ si aga n’ihu ọrọ ahụ dịn’okpuru ọchịchị ‘Anambra East,’ bụkwa ebe ọ nọrọ wee kọwaa afọ ojuju yabànyere ogoogo e ji arụ ya. Ọ kọwara na ya bụ atụmụtụmmiri ga na-ekesàra obodo atọ mmiri, nke gụnyere Agụleri, Ụmụeri na Ụmụọba-Anamma ọ bụrụ na a rụchaa ya, ebe àgbà nke abụọ ya ga-ekesàra obodo asatọ ndị ọzọmmiri, ma bụrụkwa nke a ga-amalite ọrụ na ya n’ọnwa Ekeresimeesi ahọ a. O kwuru na atụmatụ ọrụmmiri ahụ ga-enye aka kwalite ọnọdụ adịmọcha, bèlata arụrụ nsị na ịga mposi ebeekwesighị ekwesi, tinyere ọtụtụ urù ndị ọzọ dị iche iche ọ ga-ewèta, mamekwazie ka a mara na steeti ahụ akwụọla ego nke o kètàrà ịkwụ n’amụmà ọrụ ahụ,n’ihi na ọ bụ nke a na-arụ site na njikọaka steeti ahụ òtù mba ụwa ‘EuropeanUnion.’ Na ntụnye nke