Ndị otu Jude dị asọ emeela emume icheta ụbọchị ya n’Awka
NDỊ otu Jude dị asọ (St Jude Society), Awka deanary I nọ ụbọchị ụka gara aga ọnwa Novemba dị n’abalị nke mbụ mee emume ome n’afọ ha ji echeta onye dị asọ ahụ ha na-eso nzọ ụkwụ ya. Emume ahụ nke a nọrọ n’ụlọụka St Thomas Aquinas Catholic Church, GRA Awka mee, kpọkọtara ndị otu ahụ site na parish dị iche iche. N’okwuchukwu, Fada Blaise Ejike kpokuru ndị mmadụ maka ibi ndụ dị asọ dịka ụbọchị ahụ bụ ụbọchị e ji echeta ndị nsọ. Ọ kọwara na ọ bụ site na ndụ dị asọ ka mmadụ ga-eji keta alaeze Chineke. O kwuru sị: “Anyị niile ka a kpọrọ oku ịdị asọ. Ịbụ onye nsọ na-ebido ka anyị ka dị ndụ n’ụwa. Site na mmirichukwu ka a kpọrọ anyị oku ịdị asọ. Ya mere, anyị ga-etinye ike anyị niile site n’amara Chineke iji wee ruo alaeze eluigwe. Dịka anyị na-eme ihe ndị a, anyị abụrụla ndị nsọ, yaabụ ndị nwere ntụkwasa obi na Chineke.Onye ọbụla kwụ n’eziokwu kwa ụbọchị bụ onye nsọ, ọ bụ ya ka anyị ji ekwu sị: onye jisi ike n’ezi omume o ruo alaeze. Anyị ga-akwụsi ike na ya ma rịọ Chineke ka onyere anyị