Osinbajo akatọọla usoro APC ji azọ ọkwa Onyeisiala
DỊKA ọgbaghara dagoro na-etiti ndi otu ndọrọndọrọ All Progressive Congress (APC), akụkọ si n’otu ndọrọndọrọ ahụ pụta na-ekwu na Osote Onyeisiala Nigeria bụ Ọkammụta Yemi Osinbajo akatọọla ma gbarụ̀ọ́ ihu banyere atụmatụ APC ji azọ ọkwa onyeisiala na nhọpụta izugbe ahụ a ga-eme n’ahọ 2023. Onye selitere isi n’otu ndọrọndọrọ ahụ achọghị ka a kpọọ aha ya kwuru sị, “Osote Onyeisiala adọọla aka na ntị ka ndị otu pati APC hapụ iji atụmatụ Muslim–Muslim Ticket zọọ ọchịchị onyeisiala 2023.” Ya bu nwaamadi gara n’ihu kpughee ọtụtụ okwu Osinbajo kwuru banyere nke ahụ, ma mee ka a mara na usoro ahụ ndị APC ji adabaghị chaa chaa, ma kwukwa ihe ọjọọ na ajọ ọnọdụ ndị ọzọ dị icheiche nke ahụ nwere ike iweta n’idinotu nke ala Nigeria na n’ọdịnihu. Ọ dị ncheta nà n’ahọ 2014, oge Onyeisiala Muhammadu Buhari malitere ịzọ ọkwa onyeisiala, ọ kagburu usoro ndị ụka Alakụ̀ba abụọ ịbụ onyeisiala na osote onyeisiala otu oge, bụ nke mere o jiri kpọrọ Osinbajo bụ onye otu Kristi ka ọ bụrụ osote ya n’ọchịchị