Nri ndị Igbo: Osikapa nchanwụ
IHE oriri dị mma bụrụkwa ihe na-enyere ndụ aka ọkachasi mgbe onye na-esi nri ahụ ma ka e si esi nrị ọma. Na nri nke izu a, anyị ga-esi nri onye ọbụla na-enwe mmasi na ya mana ọ ga-abụ n’ụdị dị iche. Ihe oriri a bụ osikapa. Osikapa bụ nri dịbara gboo. Ọ bụnadị mgbe igwe e ji esucha osikapa adịghị ndị Igbo na-eji ikwe esucha osikapa. Anyị ga-eleba anya n’otu e si esi osikapa mgbe ahụ. Mgbe ahụ e sinye osikapa agbata obi niile ga-ama na a na-esi osikapa. Otu a ka e si esi osikapa nchụanwụ: ị mata iko ole ị chọrọ isi fụchaa ya họpụ aja dị na ya, sinye ite n’ọkụ gbanye mmiri, ọ gbọọ wunye osikapa ahụ ị fụchara, ọ gaa nkeji iri wụpụ ya na nyọ, sachaa ya nke ọma wunye osikapa ahụ na nyọ. Gbanyezie mmiri ị ga-eji sie osikapa ahụ, ọ gbọọ ị gbanye mmanụ, azụ ọkpọ, ira, nnu, okpenyi, ose, magị, yabasi, kpuchie ite ka ihe ndị ahụ I wunyere ghee. I lee ma nnụ ọ dịkwa ya, ị wunye osikapa ahụ, o ghee I were ngaji kpagharịa ya, wụkwasi nchụanwụ I bere kịrịkịrị, ọ bụrụzie oriri.