Igwe Oroma Etiti agbaala ọvala
… Chie Nnabuife, Udokwu, Okafor, Enemali, ndị ọzọ echichi Ọ KPỌTỤRỤ akpọtụ ma bụrụ emume dara ụda n’Isita Monde, ọnwa Epure dị n’abalị ise ka Eze Nwaozekwe Okeke, Igwe Ukwu 1 n’Oroma Etiti nke dị n’okpuru ọchịchị Anambra West gbara ọvala. Ọ nọ na ya mee emume agbamafọ iri iteghete na otu, cheta afọ iri anọ na ise o jiri nọrọ n’oche eze ma chie ọtụtụ ndị mmadụ echichi nke gụnyere ‘Sir’ Chuka Nnabuife, onyeisi (MD/CEO) Anambra Newspapers and Printing Corporation (ANPC), Awka, ndị na-ebipụta akwụkwọ akụkọ National Light, Ka Ọ Dị Taa na SportsLight Xtra. Emume ọvala ahụ nke weere ọnọdụ n’ụlọakwụkwọ Hope Rising Primary School, Oroma Etiti kpọkọtara ọtụtụ ndị mmadụ e ji okwu ha agba izu. Igwe ukwu nabatara ọha na eze bịara mmemme ahụ. Ka ọ na-ekpunye ndị o chiri echichi okpu ka ọ na-enye ha aha n’otu n’otu. N’okwu ya, Chuka Nnabuife onye e chiri echichi chiifu ma nye ya aha- Iru Ọma 1 n’Anam gosipụtara afọ ojuju o nwere maka nnukwu ugwu ahụ a kwanyeere ya. O kwuru sị: “Obi dị m aṅụrị na