E liela Oriakụ Okwuedo
E LIELA Oriakụ Chizoba Rosemary Okwuedo (nee Ezeoke) ‘Diesel’ ebe ụwa niile bịara kelee Chineke maka ndụ ya.Ihe niile gara nkeọma, ma be di ya ma be nna ya. Akwamozu ya ji ụka nche abalị (vigil mass) wee malite n’ezinaụlọ be nna ya bụ Pius Ezeoke n’Umugama Umuchu nke dị n’okpuru ọchịchị Aguata na steeti Anambra na Tọọzdee ọnwa Junu dị n’abalị iri na atọ. Ndị ụkọchukwu si ebe dị iche iche bịa, ha gụnyere bishọp abụọ, Bishọp Jonas Benson Okoye bụ osote bishọp dayọsis Awka na Bishọp Peter Eberechukwu Okpareke bụbu bishọp Dayọsis Ahiara na ndị ụkọchukwu dị ihe dịka iri ise. A kara ụka elimozu na be di ya na St Anthony’s Catholic Church Ifite-Ogwari nke dị n’okpuru ọchịchị Ayamelum na steeti Anambra na Fraidee ọnwa Junu dị n’abalị iri na anọ. N’okwuchukwu, Fada Benjamin Ewelu, onyeisi ụlọakwụkwọ ‘Pope John Paul II Seminary Okpuno’ chetaara ndị ụka maka nkewa nke ga-adị n’ụbọchị ikpeazu n’etiti atụrụ na ewu. Ọ kọwara na ihunanya bụ isi na njem eluigwe. Ọ dọrọ aka na ntị ma kọwaa mkpa ọ dị m