Oriakụ Buhari akwaala arịrị maka ntọrị a na-eme ụmụnwaanyị na Nigeria
NWAANYỊ izizi n’ala Nigeria bụ Oriakụ Aisha Buhari egosipụtala mwute ọ dị ya n’obi banyere ntọrọ ndị omekome na-aga n’ihu na-atọrọ ụmụnwaanyị n’ala anyị. N’ozi ya iji merube ụbọchị ụmụnwaanyị nke afọ a, International Women’s Day 2021 na Monde ọ kọwara na o doro ya anya otu ọnodụ ahụ sị aghasa mbọ a na-agba maka agụmakwụkwọ ụmụaka nwaanyị. O kwuru sị: “E wepụ korona, ụmụnwaanyị n’ala Nigeria na-aga n’ihu na-ata ahụhụ gbasara ntọrọ nke a na-atọrọ ha site n’aka ndị omekome. Dịka nne, mwute na obi mgbawa ndị ahụ na ezinaụlọ ha na-emetụta m. O dokwara m anya ọnọdụ ọjọọ ntọrọ ahụ butere n’ịghasa ihe ọma niile nke anyị nwetagoro, ọ kachasị n’ihe gbasara agụmakwụkwọ nwata nwaayị (girl child education) na alụmdi n’oge (early marriages).” Ya mere, Oriakụ Buhari kpọkuru ndị niile e ji okwu ha agba izu ka ha jiri ọkwa ha dị elu wete ntọrị a na njedebe ma hụ na ụmụaka nwaanyị nọ n’ezi nchekwa ebe ọbụla ha nwere ike ịhụ onwe ha. Nwaanyị izizi ahụ onye nke anọghị n’ala anyị ọtụtụ ọnwa ma bụrụ