Eliela Oriakụ Aghanya n'Amawbia
Ọ BỤ nnọọ emume e mere n’obi aṅụrị oge e mere mmemme elimozu Oriakụ Clara Nwakanene Aghanya, nne otu onye ọrụ, Anambra Newspapers and Printing Corporation (ANPC), ndi na-ebipụta akwụkwọ akụkọ National Light, Ka Ọ Dị Taa nakwa SportlightXtra bụ Maazị Chris Aghanya, na ngwuru di ya dị n’Ezimezi, Amawbịa nke dị n’okpuru ọchịchị Awka South, n’ime Steeti Anambra. Clara Aghanya nwụrụ ka ọ gbasịrị afọ iri asatọ na abụọ (82) ma bụrụ onye a maara dịka ‘Mmadiche’. Ndị ezinulọ ya, ikwu na ibe, enyi na ọgọ makwaara ya dịka odogwu nwaanyị, onye na atu egwu Chineke, onye udo na onye na-enwe aṅụrị mgbe ọbụla. Oge ọ na-akasi ezinulọ ha na nwa ha nwoke, Chris Aghanya obi, Onyeisi ulọọrụ Anambra Newspapers and Printing Corporation (ANPC), Sir Chuka Nnabuife na ndi ọrụ ya ụfọdụ kwuru na ha bịara ịnọnyere onye otu ha maka ọnwụ nne ya ma kọwaa na ọnwụ bụ ihe onye ọbụla ga-agabiga. N’aha ndi ọrụ ya, Nnabuife nyere ezinụlọ a ọtụtụ ihe onyinye iti aka n’obi ma kwuo ka ha ghara ibe akwa ka ndi n’enweg